Mkpughe 19:5
Revelation 19:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị, “Toonu Chineke anyị, unu ndị ohu ya niile, ndị ukwu na ndị nta, unu ndị na-atụ egwu ya.”
Revelation 19:5 in English
Revelation 19:5 · Berean Standard Bible
Then a voice came from the throne, saying: “Praise our God, all you who serve Him, and those who fear Him, small and great alike!”
Context
3Ọzọkwa, ha tiri mkpu,
“Haleluya!
Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.” 4Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị,
“Amen, Haleluya!” 5Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị,
“Toonu Chineke anyị,
unu ndị ohu ya niile,
ndị ukwu na ndị nta,
unu ndị na-atụ egwu ya.” 6Mgbe ahụ, anụkwara m olu dara ka olu igwe mmadụ dịkwa ka ụzụ mmiri na-ekwo ekwo, dịkwa ka ụda egbe eluigwe dasiri ike na-asị,
“Haleluya!
Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na-achị. 7Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọkwaa anyị ụtọ.
Ka anyị nye ya otuto.
Nʼihi na ọlụlụ di na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruola,
nwunye ya edoziekwala onwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.