Mkpughe 19:3
Revelation 19:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.”
Revelation 19:3 in English
Revelation 19:3 · Berean Standard Bible
And a second time they called out: “Hallelujah! Her smoke rises forever and ever.”
Context
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị,
“Haleluya!
Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị. 2Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.
Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe,
onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa.
Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.” 3Ọzọkwa, ha tiri mkpu,
“Haleluya!
Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.” 4Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị,
“Amen, Haleluya!” 5Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị,
“Toonu Chineke anyị,
unu ndị ohu ya niile,
ndị ukwu na ndị nta,
unu ndị na-atụ egwu ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.