Native Bible

Revelation 19:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa. Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.”

Revelation 19:2 in English

Revelation 19:2 · Berean Standard Bible

For His judgments are true and just. He has judged the great prostitute who corrupted the earth with her immorality. He has avenged the blood of His servants that was poured out by her hand.”

Context

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya! Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị. 2Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa. Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.” 3Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.” 4Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Amen, Haleluya!”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.