Mkpughe 18:8
Revelation 18:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị, ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ. A ga-eji ọkụ rechapụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike.
Revelation 18:8 in English
Revelation 18:8 · Berean Standard Bible
Therefore her plagues will come in one day— death and grief and famine— and she will be consumed by fire, for mighty is the Lord God who judges her.”
Context
6Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu.
Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere.
Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ. 7Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu
dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya.
Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị,
‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m.
Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ,
iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’* 8Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị,
ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ.
A ga-eji ọkụ rechapụ ya,
nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike. 9“Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya. 10Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị,
“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya
gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara.
Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.