Mkpughe 18:7
Revelation 18:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya. Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ, iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’*
Revelation 18:7 in English
Revelation 18:7 · Berean Standard Bible
As much as she has glorified herself and lived in luxury, give her the same measure of torment and grief. In her heart she says, ‘I sit as queen; I am not a widow and will never see grief.’
Context
5Nʼihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe.
Chineke echetakwala ajọ omume ya niile. 6Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu.
Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere.
Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ. 7Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu
dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya.
Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị,
‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m.
Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ,
iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’* 8Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị,
ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ.
A ga-eji ọkụ rechapụ ya,
nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike. 9“Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.