Mkpughe 18:10
Revelation 18:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara. Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’
Revelation 18:10 in English
Revelation 18:10 · Berean Standard Bible
In fear of her torment, they will stand at a distance and cry out: “Woe, woe to the great city, the mighty city of Babylon! For in a single hour your judgment has come.”
Context
8Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị,
ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ.
A ga-eji ọkụ rechapụ ya,
nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike. 9“Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya. 10Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị,
“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya
gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara.
Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’ 11“Ndị ahịa nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa ụjụ nʼihi ya, nʼihi na ọ dịkwaghị onye na-azụ ihe ahịa ha ọzọ. 12Ngwa ahịa ọlaedo gị, na ọlaọcha, na ọla e ji achọ mma na nkume oke ọnụahịa, ezi akwa ọcha, na akwa uhie uhie, na akwa lọrịlọrị, na akwa odo odo, osisi niile na-esi isi ọma, ihe niile e ji ọdụ enyi mee, ngwa ahịa niile e ji osisi niile dị oke ọnụahịa mee, bronz, igwe na nkume mabụl.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.