Mkpughe 18:20
Revelation 18:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya, unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ, unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ. Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpe nʼihi mmeso ya megide unu.”
Revelation 18:20 in English
Revelation 18:20 · Berean Standard Bible
Rejoice over her, O heaven, O saints and apostles and prophets, because God has pronounced for you His judgment against her.
Context
18na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’ 19Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị,
“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha ya
ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri
ghọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya.
Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’ 20“Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya,
unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ,
unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ.
Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpe
nʼihi mmeso ya megide unu.” 21Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị,
“Otu a ka a ga-esi tufuo
Babilọn obodo ukwu ahụ,
agaghị ahụkwa ya ọzọ. 22Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ.
Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ.
Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla
nʼime gị ọzọ.
Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri
nʼime gị ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.