Mkpughe 18:22
Revelation 18:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ. Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ. Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla nʼime gị ọzọ. Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri nʼime gị ọzọ.
Revelation 18:22 in English
Revelation 18:22 · Berean Standard Bible
And the sound of harpists and musicians, of flute players and trumpeters, will never ring out in you again. Nor will any craftsmen of any trade be found in you again, nor the sound of a millstone be heard in you again.
Context
20“Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya,
unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ,
unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ.
Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpe
nʼihi mmeso ya megide unu.” 21Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị,
“Otu a ka a ga-esi tufuo
Babilọn obodo ukwu ahụ,
agaghị ahụkwa ya ọzọ. 22Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ.
Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ.
Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla
nʼime gị ọzọ.
Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri
nʼime gị ọzọ. 23Ìhè nke sitere nʼoriọna
agaghị acha nʼime gị ọzọ.
Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị
na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa.
Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa,
ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa. 24Nʼime ya ka a hụrụ ọbara ndị amụma niile, na nke ndị nsọ niile,
na nke ndị ọzọ ahụ niile e gburu nʼụwa.”
18:2 Aịz 21:9
18:4 Jer 51:45
18:7 Aịz 47:7,8
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.