Mkpughe 12:8
Revelation 12:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ma e meriri ha, ha enwekwaghị ọnọdụ ọbụla nʼeluigwe.
Revelation 12:8 in English
Revelation 12:8 · Berean Standard Bible
But the dragon was not strong enough, and no longer was any place found in heaven for him and his angels.
Context
6Ma nwanyị ahụ si nʼebe ahụ gbapụ gbalaa nʼọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka a ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260). 7Mgbe ahụ, agha dapụtara nʼeluigwe. Maikel na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide agwọ ochie ahụ (a na-akpọ dragọn). Dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha nke ha, 8ma e meriri ha, ha enwekwaghị ọnọdụ ọbụla nʼeluigwe. 9Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile. 10Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị,
“O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike
na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya,
ha abụrụla ihe dị ire.
Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo
onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo.
Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.