Mkpughe 12:10
Revelation 12:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị, “O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya, ha abụrụla ihe dị ire. Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke.
Revelation 12:10 in English
Revelation 12:10 · Berean Standard Bible
And I heard a loud voice in heaven saying: “Now have come the salvation and the power and the kingdom of our God, and the authority of His Christ. For the accuser of our brothers has been thrown down— he who accuses them day and night before our God.
Context
8ma e meriri ha, ha enwekwaghị ọnọdụ ọbụla nʼeluigwe. 9Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile. 10Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị,
“O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike
na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya,
ha abụrụla ihe dị ire.
Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo
onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo.
Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke. 11Ha lụgburu ya nʼagha
site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ
na site nʼama nke okwu ọnụ ha,
nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa,
kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ. 12Ya mere, ṅụrịanụ ọṅụ eluigwe
ma unu ndị niile bi nʼime ya.
Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼụwa na osimiri
nʼihi na ekwensu abịakwutela unu.
O jirila oke ọnụma bịakwute unu.
Ọ makwaara na oge a o nwere ehighị nne.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.