Mkpughe 12:11
Revelation 12:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha lụgburu ya nʼagha site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ na site nʼama nke okwu ọnụ ha, nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa, kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ.
Revelation 12:11 in English
Revelation 12:11 · Berean Standard Bible
They have conquered him by the blood of the Lamb and by the word of their testimony. And they did not love their lives so as to shy away from death.
Context
9Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile. 10Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị,
“O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike
na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya,
ha abụrụla ihe dị ire.
Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo
onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo.
Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke. 11Ha lụgburu ya nʼagha
site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ
na site nʼama nke okwu ọnụ ha,
nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa,
kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ. 12Ya mere, ṅụrịanụ ọṅụ eluigwe
ma unu ndị niile bi nʼime ya.
Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼụwa na osimiri
nʼihi na ekwensu abịakwutela unu.
O jirila oke ọnụma bịakwute unu.
Ọ makwaara na oge a o nwere ehighị nne.” 13Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nʼụwa, ọ chụsoro nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ ọsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.