Native Bible

Psalms 99:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya, Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya; ha kpọkuru Onyenwe anyị ọ zakwara ha.

Psalms 99:6 in English

Psalms 99:6 · Berean Standard Bible

Moses and Aaron were among His priests; Samuel was among those who called on His name. They called to the LORD and He answered.

Context

4Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya, i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike; nʼime Jekọb ka i mere ihe ziri ezi na ihe dị mma. 5Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu, feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya; ọ dị nsọ. 6Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya, Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya; ha kpọkuru Onyenwe anyị ọ zakwara ha. 7Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii. Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha. 8O Onyenwe anyị, Chineke anyị, ị zara ha; ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie, nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.