Abụ Ọma 99:6
Psalms 99:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya, Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya; ha kpọkuru Onyenwe anyị ọ zakwara ha.
Psalms 99:6 in English
Psalms 99:6 · Berean Standard Bible
Moses and Aaron were among His priests; Samuel was among those who called on His name. They called to the LORD and He answered.
Context
4Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya,
i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike;
nʼime Jekọb ka i mere
ihe ziri ezi na ihe dị mma. 5Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu,
feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya;
ọ dị nsọ. 6Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya,
Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya;
ha kpọkuru Onyenwe anyị
ọ zakwara ha. 7Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii.
Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha. 8O Onyenwe anyị, Chineke anyị,
ị zara ha;
ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie,
nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.