Native Bible

Psalms 99:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii. Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha.

Psalms 99:7 in English

Psalms 99:7 · Berean Standard Bible

He spoke to them from the pillar of cloud; they kept His decrees and the statutes He gave them.

Context

5Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu, feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya; ọ dị nsọ. 6Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya, Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya; ha kpọkuru Onyenwe anyị ọ zakwara ha. 7Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii. Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha. 8O Onyenwe anyị, Chineke anyị, ị zara ha; ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie, nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha. 9Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu; na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ, nʼihi na onye dị nsọ ka Onyenwe anyị Chineke anyị bụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.