Abụ Ọma 93:3
Psalms 93:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke osimiri niile amaliela elu, O Onyenwe anyị; oke osimiri niile eweliela olu ha elu; ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ.
Psalms 93:3 in English
Psalms 93:3 · Berean Standard Bible
The floodwaters have risen, O LORD; the rivers have raised their voice; the seas lift up their pounding waves.
Context
1Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe;
Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu;
nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya. 2Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie;
ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị. 3Oke osimiri niile amaliela elu, O Onyenwe anyị;
oke osimiri niile eweliela olu ha elu;
ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ. 4Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu
karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme,
ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri. 5Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike;
ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma
ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.