Native Bible

Psalms 93:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu; nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya.

Psalms 93:1 in English

Psalms 93:1 · Berean Standard Bible

The LORD reigns! He is robed in majesty; the LORD has clothed and armed Himself with strength. The world indeed is firmly established; it cannot be moved.

Context

1Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu; nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya. 2Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie; ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị. 3Oke osimiri niile amaliela elu, O Onyenwe anyị; oke osimiri niile eweliela olu ha elu; ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.