Native Bible

Psalms 90:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị; anyị na-amakwa jijiji nʼihi ọnụma gị.

Psalms 90:7 in English

Psalms 90:7 · Berean Standard Bible

For we are consumed by Your anger and terrified by Your wrath.

Context

5Nʼime ụra nke ọnwụ ka ị na-ekpochapụ mmadụ; ha dịka ahịhịa ọhụrụ nke na-epupụta nʼisi ụtụtụ, 6ọ bụ ezie na ọ na-agbawa ụzarị na-etokwa eto nʼụtụtụ, ma nʼanyasị, ọ na-akpọnwụ ma-achanwụkwaa. 7E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị; anyị na-amakwa jijiji nʼihi ọnụma gị. 8Ị gbasaala njehie anyị niile nʼihu gị. Ị na-ahụzukwa mmehie nzuzo anyị niile. 9Ogologo ụbọchị anyị niile na-agabiga nʼoke iwe gị; afọ ndụ anyị nke fọdụrụ ka anyị na-ebi dịka okwu e ji nwayọọ kwuo na mwute.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.