Abụ Ọma 90:9
Psalms 90:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ogologo ụbọchị anyị niile na-agabiga nʼoke iwe gị; afọ ndụ anyị nke fọdụrụ ka anyị na-ebi dịka okwu e ji nwayọọ kwuo na mwute.
Psalms 90:9 in English
Psalms 90:9 · Berean Standard Bible
For all our days decline in Your fury; we finish our years with a sigh.
Context
7E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị;
anyị na-amakwa jijiji nʼihi ọnụma gị. 8Ị gbasaala njehie anyị niile nʼihu gị.
Ị na-ahụzukwa mmehie nzuzo anyị niile. 9Ogologo ụbọchị anyị niile na-agabiga nʼoke iwe gị;
afọ ndụ anyị nke fọdụrụ ka anyị na-ebi dịka okwu e ji nwayọọ kwuo na mwute. 10Ogologo ụbọchị anyị niile nwere ike ruo afọ iri asaa,
maọbụ afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na ike anyị adịgide,
ma otu ọ dị, nke a ga-asị na ọ bụ ya kachasị mma na-ejupụta na nsogbu na ịsụ ude,
nʼihi na ha na-agabiga ọsịịsọ, anyị onwe anyị na-efelakwa. 11Onye pụrụ ịghọta ịdị ike nke oke iwe gị?
Nʼihi na oke iwe gị dị ukwuu dịka ịtụ egwu kwesiri gị si dị ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.