Abụ Ọma 90:5
Psalms 90:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼime ụra nke ọnwụ ka ị na-ekpochapụ mmadụ; ha dịka ahịhịa ọhụrụ nke na-epupụta nʼisi ụtụtụ,
Psalms 90:5 in English
Psalms 90:5 · Berean Standard Bible
You whisk them away in their sleep; they are like the new grass of the morning—
Context
3Ị na-eme ka mmadụ laghachi bụrụ aja
mgbe i kwuru okwu sị, “Unu ụmụ mmadụ, laghachi bụrụ aja.” 4Puku afọ dị nʼanya gị dịka otu ụbọchị;
ha dịka ụnyaahụ gafere agafe
maọbụ ka otu awa nke anyasị.* 5Nʼime ụra nke ọnwụ ka ị na-ekpochapụ mmadụ;
ha dịka ahịhịa ọhụrụ nke na-epupụta nʼisi ụtụtụ, 6ọ bụ ezie na ọ na-agbawa ụzarị na-etokwa eto nʼụtụtụ,
ma nʼanyasị, ọ na-akpọnwụ ma-achanwụkwaa. 7E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị;
anyị na-amakwa jijiji nʼihi ọnụma gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.