Abụ Ọma 90:12
Psalms 90:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ, ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.
Psalms 90:12 in English
Psalms 90:12 · Berean Standard Bible
So teach us to number our days, that we may present a heart of wisdom.
Context
10Ogologo ụbọchị anyị niile nwere ike ruo afọ iri asaa,
maọbụ afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na ike anyị adịgide,
ma otu ọ dị, nke a ga-asị na ọ bụ ya kachasị mma na-ejupụta na nsogbu na ịsụ ude,
nʼihi na ha na-agabiga ọsịịsọ, anyị onwe anyị na-efelakwa. 11Onye pụrụ ịghọta ịdị ike nke oke iwe gị?
Nʼihi na oke iwe gị dị ukwuu dịka ịtụ egwu kwesiri gị si dị ukwuu. 12Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ,
ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara. 13O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị?
Meere ndị ohu gị ebere. 14Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ,
ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.