Abụ Ọma 90:14
Psalms 90:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ, ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile.
Psalms 90:14 in English
Psalms 90:14 · Berean Standard Bible
Satisfy us in the morning with Your loving devotion, that we may sing for joy and be glad all our days.
Context
12Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ,
ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara. 13O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị?
Meere ndị ohu gị ebere. 14Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ,
ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile. 15Mee ka anyị nwee obi ụtọ, nke ọnụọgụgụ ụbọchị ya ga-adịkwa ka ọnụọgụgụ ụbọchị niile ị tara anyị ahụhụ,
ka ọnụọgụgụ afọ ya dịkwa ka ọnụọgụgụ afọ niile anyị hụrụla nsogbu. 16Kwere ka ndị ohu gị hụ ọrụ gị dị iche iche,
ka ụmụ ha hụkwa ịma mma gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.