Native Bible

Psalms 89:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala.

Psalms 89:39 in English

Psalms 89:39 · Berean Standard Bible

You have renounced the covenant with Your servant and sullied his crown in the dust.

Context

37Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa. E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” Sela 38Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa, i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ. 39Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala. 40Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu, i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa. 41Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere. Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.