Native Bible

Psalms 89:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa, i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ.

Psalms 89:38 in English

Psalms 89:38 · Berean Standard Bible

Now, however, You have spurned and rejected him; You are enraged by Your anointed one.

Context

36na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide. 37Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa. E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” Sela 38Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa, i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ. 39Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala. 40Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu, i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.