Abụ Ọma 89:22
Psalms 89:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede; ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya.
Psalms 89:22 in English
Psalms 89:22 · Berean Standard Bible
No enemy will exact tribute; no wicked man will oppress him.
Context
20Achọtala m Devid ohu m,
were mmanụ nsọ m tee ya. 21Aka m ga-agba ya ume;
nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike. 22Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede;
ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya. 23Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya.
Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi. 24Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya,
site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.