Abụ Ọma 83:3
Psalms 83:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị; ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya.
Psalms 83:3 in English
Psalms 83:3 · Berean Standard Bible
With cunning they scheme against Your people and conspire against those You cherish,
Context
1O! Chineke agbachikwala nkịtị.
Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu,
anọkwala jụụ. 2Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ,
ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha. 3Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị;
ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya. 4Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi,
ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ.” 5Ha ji otu obi na-agbarịta izu;
ha agbaala ndụ imegide gị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.