Abụ Ọma 79:12
Psalms 79:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị.
Psalms 79:12 in English
Psalms 79:12 · Berean Standard Bible
Pay back into the laps of our neighbors sevenfold the reproach they hurled at You, O Lord.
Context
10Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị,
“Olee ebe Chineke ha nọ?”
Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ,
na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru. 11Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ;
site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ. 12Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị
nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị. 13Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị
ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi;
anyị ga na-ekwupụta otuto gị,
site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.