Abụ Ọma 79:10
Psalms 79:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?” Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ, na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru.
Psalms 79:10 in English
Psalms 79:10 · Berean Standard Bible
Why should the nations ask, “Where is their God?” Before our eyes, make known among the nations Your vengeance for the bloodshed of Your servants.
Context
8Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere;
ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị,
nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa. 9Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,
nʼihi ebube nke aha gị;
napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile
nʼihi aha gị. 10Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị,
“Olee ebe Chineke ha nọ?”
Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ,
na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru. 11Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ;
site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ. 12Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị
nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.