Abụ Ọma 79:8
Psalms 79:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.
Psalms 79:8 in English
Psalms 79:8 · Berean Standard Bible
Do not hold past sins against us; let Your compassion come quickly, for we are brought low.
Context
6Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị
dịka Chineke oke iwe gị,
bụ alaeze niile ndị ahụ
na-adịghị akpọku aha gị; 7nʼihi na ha eripịala Jekọb
mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu. 8Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere;
ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị,
nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa. 9Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,
nʼihi ebube nke aha gị;
napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile
nʼihi aha gị. 10Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị,
“Olee ebe Chineke ha nọ?”
Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ,
na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.