Native Bible

Psalms 78:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha, oke iwe ya, na iwe ya, na mmeso nke iwe ya, ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe na-eleghị anya nʼazụ.

Psalms 78:49 in English

Psalms 78:49 · Berean Standard Bible

He unleashed His fury against them, wrath, indignation, and calamity— a band of destroying angels.

Context

47O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha, jirikwa igirigi jụrụ oke oyi bibie osisi sikamọ ha niile. 48O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri, werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe. 49O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha, oke iwe ya, na iwe ya, na mmeso nke iwe ya, ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe na-eleghị anya nʼazụ. 50O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso; o gbochighị ka ha ghara ịnwụ; kama o nyefere ndụ ha nʼaka ọrịa na-efe efe. 51O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom nʼime ụlọ ikwu Ham.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.