Abụ Ọma 78:48
Psalms 78:48 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri, werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe.
Psalms 78:48 in English
Psalms 78:48 · Berean Standard Bible
He abandoned their cattle to the hail and their livestock to bolts of lightning.
Context
46O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha,
zitekwa igurube nke ripịara ihe niile a gaara eweta dịka ihe ubi. 47O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha,
jirikwa igirigi jụrụ oke oyi bibie osisi sikamọ ha niile. 48O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri,
werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe. 49O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha,
oke iwe ya, na iwe ya, na mmeso nke iwe ya,
ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe na-eleghị anya nʼazụ. 50O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso;
o gbochighị ka ha ghara ịnwụ;
kama o nyefere ndụ ha nʼaka ọrịa na-efe efe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.