Abụ Ọma 78:46
Psalms 78:46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha, zitekwa igurube nke ripịara ihe niile a gaara eweta dịka ihe ubi.
Psalms 78:46 in English
Psalms 78:46 · Berean Standard Bible
He gave their crops to the grasshopper, the fruit of their labor to the locust.
Context
44O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara.
Ha enwekwaghị ike ịṅụ mmiri si na ha. 45O zigakwara igwe ijiji nʼetiti ha, nke tara ha,
zitekwa awọ nʼala ha, nke bibiri ha. 46O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha,
zitekwa igurube nke ripịara ihe niile a gaara eweta dịka ihe ubi. 47O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha,
jirikwa igirigi jụrụ oke oyi bibie osisi sikamọ ha niile. 48O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri,
werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.