Abụ Ọma 78:4
Psalms 78:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
Psalms 78:4 in English
Psalms 78:4 · Berean Standard Bible
We will not hide them from their children, but will declare to the next generation the praises of the LORD and His might, and the wonders He has performed.
Context
2Aga m eji ilu malite okwu m,
aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie; 3ihe ndị anyị nụrụla, marakwa,
ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị. 4Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a,
kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu
akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị,
na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere. 5O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya,
mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel,
bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị,
ka ha kuziere ụmụ ha, 6ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya,
ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị,
ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.