Abụ Ọma 78:3
Psalms 78:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị.
Psalms 78:3 in English
Psalms 78:3 · Berean Standard Bible
that we have heard and known and our fathers have relayed to us.
Context
1Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi;
geenụ ntị nʼokwu ọnụ m. 2Aga m eji ilu malite okwu m,
aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie; 3ihe ndị anyị nụrụla, marakwa,
ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị. 4Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a,
kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu
akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị,
na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere. 5O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya,
mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel,
bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị,
ka ha kuziere ụmụ ha,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.