Abụ Ọma 78:21
Psalms 78:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Onyenwe anyị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya; ọkụ ya repịara Jekọb, iwe ọkụ ya biliri megide Izrel.
Psalms 78:21 in English
Psalms 78:21 · Berean Standard Bible
Therefore the LORD heard and was filled with wrath; so a fire was kindled against Jacob, and His anger flared against Israel,
Context
19Ha kwuhiere Chineke;
jụọ ya ọnụ sị, “Chineke ọ pụrụ inye anyị
ezi nri na mmiri ọṅụṅụ nʼọzara a? 20Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe,
mee ka mmiri sọpụta,
mmiri iyi sọpụtara nʼebe o hiri nne,
ma ọ pụrụ inye anyị nri?
Ọ pụrụ inye ndị ya anụ?” 21Mgbe Onyenwe anyị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya;
ọkụ ya repịara Jekọb,
iwe ọkụ ya biliri megide Izrel. 22Nʼihi na ha ekwenyeghị na Chineke,
maọbụ tụkwasị obi na nzọpụta ya. 23Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu
meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.