Native Bible

Psalms 78:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa, mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ.

Psalms 78:18 in English

Psalms 78:18 · Berean Standard Bible

They willfully tested God by demanding the food they craved.

Context

16O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta, mee ka mmiri rudata dịka osimiri. 17Ha nọgidere na-emehie megide ya. Ha nupuru isi nʼọzara megide Onye kachasị ihe niile elu. 18Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa, mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ. 19Ha kwuhiere Chineke; jụọ ya ọnụ sị, “Chineke ọ pụrụ inye anyị ezi nri na mmiri ọṅụṅụ nʼọzara a? 20Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe, mee ka mmiri sọpụta, mmiri iyi sọpụtara nʼebe o hiri nne, ma ọ pụrụ inye anyị nri? Ọ pụrụ inye ndị ya anụ?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.