Native Bible

Psalms 78:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie, jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile.

Psalms 78:14 in English

Psalms 78:14 · Berean Standard Bible

He led them with a cloud by day and with a light of fire all night.

Context

12Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha nʼala Ijipt na nʼọhịa Zoan. 13O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha. O mere ka mmiri ahụ guzo ọtọ dịka mgbidi. 14O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie, jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile. 15Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara, si otu a nye ha mmiri hiri nne, dịka a ga-asị na ọ bụ mmiri si nʼọtụtụ oke osimiri. 16O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta, mee ka mmiri rudata dịka osimiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.