Abụ Ọma 74:3
Psalms 74:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a. Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a.
Psalms 74:3 in English
Psalms 74:3 · Berean Standard Bible
Turn Your steps to the everlasting ruins, to everything in the sanctuary the enemy has destroyed.
Context
1Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi?
Gịnị mere iwe gị ji akwụ anwụrụ megide igwe atụrụ ndị ị na-azụ? 2Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie,
ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara,
nʼugwu Zayọn ebe i biri. 3Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a.
Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a. 4Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị.
Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama. 5Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike
ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.