Native Bible

Psalms 74:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị. Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama.

Psalms 74:4 in English

Psalms 74:4 · Berean Standard Bible

Your foes have roared within Your meeting place; they have unfurled their banners as signs,

Context

2Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie, ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara, nʼugwu Zayọn ebe i biri. 3Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a. Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a. 4Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị. Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama. 5Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa. 6Ha ji anyụike na egbugbu ha kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.