Native Bible

Psalms 68:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ, ma ṅụrịa nʼihu Chineke; ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ.

Psalms 68:3 in English

Psalms 68:3 · Berean Standard Bible

But the righteous will be glad and rejoice before God; they will celebrate with joy.

Context

1Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro ya site nʼihu ya gbalaga. 2Dịka ikuku si achụsa anwụrụ ọkụ,* sikwa otu a chụsaa ha. Dịka mmanụ na-ehi ụra si agbaze nʼọkụ, ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa nʼiyi nʼihu Chineke. 3Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ, ma ṅụrịa nʼihu Chineke; ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ. 4Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto, toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya, Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya. 5Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha, onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.