Abụ Ọma 68:3
Psalms 68:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ, ma ṅụrịa nʼihu Chineke; ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ.
Psalms 68:3 in English
Psalms 68:3 · Berean Standard Bible
But the righteous will be glad and rejoice before God; they will celebrate with joy.
Context
1Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị;
ka ndị iro ya site nʼihu ya gbalaga. 2Dịka ikuku si achụsa anwụrụ ọkụ,* sikwa otu a chụsaa ha.
Dịka mmanụ na-ehi ụra si agbaze nʼọkụ,
ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa nʼiyi nʼihu Chineke. 3Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ,
ma ṅụrịa nʼihu Chineke;
ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ. 4Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto,
toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya,
Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya. 5Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha,
onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.