Abụ Ọma 68:2
Psalms 68:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka ikuku si achụsa anwụrụ ọkụ,* sikwa otu a chụsaa ha. Dịka mmanụ na-ehi ụra si agbaze nʼọkụ, ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa nʼiyi nʼihu Chineke.
Psalms 68:2 in English
Psalms 68:2 · Berean Standard Bible
As smoke is blown away, You will drive them out; as wax melts before the fire, the wicked will perish in the presence of God.
Context
1Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị;
ka ndị iro ya site nʼihu ya gbalaga. 2Dịka ikuku si achụsa anwụrụ ọkụ,* sikwa otu a chụsaa ha.
Dịka mmanụ na-ehi ụra si agbaze nʼọkụ,
ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa nʼiyi nʼihu Chineke. 3Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ,
ma ṅụrịa nʼihu Chineke;
ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ. 4Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto,
toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya,
Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.