Abụ Ọma 66:12
Psalms 66:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu; anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee. Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile.
Psalms 66:12 in English
Psalms 66:12 · Berean Standard Bible
You let men ride over our heads; we went through fire and water, but You brought us into abundance.
Context
10Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị;
ị nụchara anyị dịka ọlaọcha. 11Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ,
ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị. 12I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu;
anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee.
Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile. 13Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị,
imezu nkwa m kwere gị 14nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo,
ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.