Abụ Ọma 56:4
Psalms 56:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya, nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m?
Psalms 56:4 in English
Psalms 56:4 · Berean Standard Bible
In God, whose word I praise— in God I trust. I will not be afraid. What can man do to me?
Context
2Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m;
site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m. 3Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m. 4Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya,
nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.
Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m? 5Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi;
oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ. 6Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha,
ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile,
dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.