Native Bible

Psalms 56:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.

Psalms 56:3 in English

Psalms 56:3 · Berean Standard Bible

When I am afraid, I put my trust in You.

Context

1O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m; ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m. 2Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m; site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m. 3Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m. 4Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya, nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m? 5Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi; oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.