Abụ Ọma 56:3
Psalms 56:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.
Psalms 56:3 in English
Psalms 56:3 · Berean Standard Bible
When I am afraid, I put my trust in You.
Context
1O Chineke, meere m ebere,
nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m;
ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m. 2Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m;
site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m. 3Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m. 4Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya,
nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.
Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m? 5Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi;
oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.