Abụ Ọma 56:6
Psalms 56:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha, ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile, dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m.
Psalms 56:6 in English
Psalms 56:6 · Berean Standard Bible
They conspire, they lurk, they watch my steps while they wait to take my life.
Context
4Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya,
nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.
Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m? 5Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi;
oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ. 6Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha,
ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile,
dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m. 7Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ;
o Chineke, nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala. 8Depụta akwa arịrị m;
chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị.
Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.