Native Bible

Psalms 55:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị, apụrụ m ịnagide ya; a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m, apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ.

Psalms 55:12 in English

Psalms 55:12 · Berean Standard Bible

For it is not an enemy who insults me; that I could endure. It is not a foe who rises against me; from him I could hide.

Context

10Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya; iro na mmegbu dị nʼime ya. 11A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo; ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo. 12A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị, apụrụ m ịnagide ya; a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m, apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ. 13Maọbụ gị, nwoke dịka m, onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma, 14onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ, nʼụlọ Chineke, ka anyị na-ejegharị nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.