Abụ Ọma 55:11
Psalms 55:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo; ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo.
Psalms 55:11 in English
Psalms 55:11 · Berean Standard Bible
Destruction is within; oppression and deceit never leave the streets.
Context
9O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu,
nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo. 10Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya;
iro na mmegbu dị nʼime ya. 11A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo;
ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo. 12A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị,
apụrụ m ịnagide ya;
a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m,
apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ. 13Maọbụ gị, nwoke dịka m,
onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.