Abụ Ọma 53:2
Psalms 53:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya, ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta, onye nke na-achọ Chineke.
Psalms 53:2 in English
Psalms 53:2 · Berean Standard Bible
God looks down from heaven upon the sons of men to see if any understand, if any seek God.
Context
1Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya,
“Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.”
Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe. 2Chineke sitere nʼeluigwe
na-ele ụmụ mmadụ anya,
ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta,
onye nke na-achọ Chineke. 3Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi,
ọ dịghị ọ bụladị otu onye. 4Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe?
Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri,
ha adịghị akpọkukwa Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.