Abụ Ọma 53
Psalms 53 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya,
“Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.”
Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe. 2Chineke sitere nʼeluigwe
na-ele ụmụ mmadụ anya,
ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta,
onye nke na-achọ Chineke. 3Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi,
ọ dịghị ọ bụladị otu onye. 4Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe?
Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri,
ha adịghị akpọkukwa Chineke. 5Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu,
ebe ọ dịghị ihe egwu na-adịghị.
Chineke fesasịrị ọkpụkpụ ndị niile megidere gị;
i mere ka ihere mee ha, nʼihi na Chineke ajụla ha. 6O, a sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta!
Mgbe Chineke ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha,
ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.