Abụ Ọma 53:1
Psalms 53:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
Psalms 53:1 in English
Psalms 53:1 · Berean Standard Bible
The fool says in his heart, “There is no God.” They are corrupt; their ways are vile. There is no one who does good.
Context
1Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya,
“Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.”
Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe. 2Chineke sitere nʼeluigwe
na-ele ụmụ mmadụ anya,
ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta,
onye nke na-achọ Chineke. 3Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi,
ọ dịghị ọ bụladị otu onye.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.