Native Bible

Psalms 37:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.

Psalms 37:9 in English

Psalms 37:9 · Berean Standard Bible

For the evildoers will be cut off, but those who hope in the LORD will inherit the land.

Context

7Dere duu nʼihu Onyenwe anyị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile. 8Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ. 9Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha. 10Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga; ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha. 11Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, ha ga-enwekwa udo dị ukwuu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.