Abụ Ọma 37:7
Psalms 37:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dere duu nʼihu Onyenwe anyị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.
Psalms 37:7 in English
Psalms 37:7 · Berean Standard Bible
Be still before the LORD and wait patiently for Him; do not fret when men prosper in their ways, when they carry out wicked schemes.
Context
5Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị;
tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a: 6Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ,
meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie. 7Dere duu nʼihu Onyenwe anyị,
were ndidi chere ya;
echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu,
mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile. 8Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe;
echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ. 9Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi,
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.